Otu pentecostal fellowship of Nigeria PFN akatola mmachi ahụ gọọmenti Anambra Steeti machiri izi ozi ọma n’okporo ụzọ ọhaneze yana ahịa ndị enwegasiri na state ahụ.

Written by on March 17, 2025

Onye ji ọkwa osote odeakwụkwọ nyere otu pentecostal fellowship of Nigeria nke mpaghara South East zone bụ Rev Blessed Amalambu akatola ya n’ebe ọ dị oke elu bụ mmachi ahụ gọọmenti Anambra Steeti nọrọ na ọ dị nso a machie igbasa ozi ọma osebulu ụwa n’okporo ụzọ ọhaneze yana ahịa ndị enwegasiri na Anambra Steeti.

Ọ kọwara nzọụkwụ nke ọchịchị state ahụ bụ Gov Chukwuma Soludo nọ n’isi ya dịka nke na awụ akpata oyi ma na e duhie ụzọ.

Ozi mere ka amata na mmachi ahụ bụ iji gbochie oke ụzụ na mkpọtụ na apụtakari ihe n’oge ozi ọma ahụ ma bụrụ nke e kwuru na onye dara iwu ọhụrụ ahụ ga-akwụ akatamkpo ego.

Mana nzaghachi nyere mmachi ahụ ka Rev Amalambu kwuru na ndị otu Kristi agaghị anọrọla nwayọọ ma dere duu hụ ka mmadụ na e wezụga ihe Chukwu guzobegoru etu ọ ga-adị.

Ọ rịọrọ Gov Soludo bụkwa onye otu Kristi ka o chegharịa uche ma kwụsị mmachi ahụ.

Dịka onye ụkọ Chukwu ahụ sịrị kọwaa, na Gov Chukwuma Soludo kwesịrị ịkpọturu ndị mara nke ekwe na-akụ ka ha gwa ya etu ọ ga-esi dozie ọnọdụ ahụ iji gbanahụ ịnapụ ndị otu Kristi oke na ugwu ruru ha.

Ihe ndị ọzọ onye ụkọ Chukwu ahụ kpọrọ oku ya gụnyere ikpatughari aka na iwu na-achị ala anyị nke afọ 1999 iji nye okpukperechi ọbụla oke nhatanha tinyere ịhapụ ka ana agbasa ozi ọma na mbara ezi maka ọdịmma nke ndị na agaghị ụka.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited