Pope Francis nke ụlọ ụka nzukọ nsọ Catholic agbakela ma nwere onwe ya n’ụlọ ọgwụ.
Written by Onyinye on March 24, 2025
Pope Francis bụ onye ndu nke ụlọ nzukọ nsọ Catholic abụrụla onye ahụrụ nke mbụ na mbụ ya na elu ụlọ elu dina ụlọ ọgwụ Gemeli hospital nke dị n’obodo Rome na-agọzi ndị mmadụ Kemgbe ebuchara ya gaa n’ụlọ ọgwụ n’abalị iri na anọ nke ọnwa February n’afọ a.
Nnukwute onye ụkọ Chukwu ahụ ka dibịa oyibo ya gwara ya laa na o nwerego onwe ya mana ọ ga ezumike ihe ruru ọnwa abụọ tupu omalite ọrụ ya ọzọ.
Otu onye dibịa oyibo bụ Dr Sergio Alfieri kwuru na ọ bụ eziokwu na Pope enwetechabeghi onwe ya etu a chọrọ mana onweghizi ọrịa oyi akpọrọ pneumonia nke bụ na ọ ga amalite ọrụ ya ọzọ n’oge na-adịghị anya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.