Ulo ikpe ukwu mba India enyela iwu ka atohapu otu nwoke sitere mba Britain

Written by on March 5, 2025

Ulo ikpe ukwu mba India enyela iwu ka atohapu otu nwoke sitere mba Britain aruru nga afo isii n’ekpeghi ya ikpe obula kwere maka ebubo nruru aka n’okwa ochichi.

Christina James Michael bu onye olu nchekwa gbagoro n’okwa ,ka ana ebo obubo na onyere ndi olu nchekwa mba India aka azu iji turu ugo n’olu ngo akporo multimillion dollars helicopter contract maka ulo olu British -Italian defence company dina AustaWestland. Bu nke ogonariri.

Yabu nwa amadi ka atukpunyere n’ ulo nga di na India site na mba united Arab Emirates kemgbe afo 2018 ma ka noruo k’ odi ugbua n’ihe okaikpe kowara dika onodu puru iche .

Iga echeta na govt mba India noro n’ afo 2010 binye aka nkwekorita hana ulo olu AustaWestland izuta ugbo elu nshiko di iri na abuo.

Ihe ngbagboju anya a putaziri ihe n’ oge ulo olu federal auditor nke mba India weputara ozi nke n’ egosi na ochichi mba ahu akwufela ugwo na yabu nkwekorita bu nke emechara kachapu n’ afo 2014.

N’ ozi ulo ikpe weputara ka anoro huta ebubo na mazi michel natara ego ruru $44.7m dollars, ebe onye okaiwu ya n’ akowa na enweghi ihe aka ebe n’ egosi na okpara yabu aru.

Nkea kpatara ulo ikpe jiri Nara ya n’ aka ebe ma nye iwu ka atohapu n’ ulo nga kamana ogaghi esitenwu na mba India puo kwere maka njichi ejichiriri mpepe akwukwo ikikere iji eme njem.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited