Blog one column
Otu ahu nona isi ugbo izo maka Biafra dika mba kwuru na onwe ya bu Indigenous People of Biafra IPOB adola aka na nti dosia ya ike dogara ndi ekperima ka ha zeere mpaghara South East obodo a ma obukwanu ha eche aka ghoro odachi sona agwa ekperima ha. Otu IPOB gara na iru kwunwuo […]
Ndi uwe oji ala anyi na Enugu State ebuola agha di egwu buso ndi ekperima putara imekpa ndi mmadu aru na oge mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru na akpudobe nso dika habu ndi uwe oji sitere na ibu agha a nwuchikoro umunwoke abuo ana enyoenyo maka iji egbe aga ori na State a. Na […]
Onye Director General nyere nyere ulo olu National Youth Service Corps NYSC bu Brig Gen YD Ahmed akpola oku nruko olu nyere mbo ana agba ichoputa otu onye ji otu afo agara ala anyi ozi na yabu usoro NYSC bu mazi Yahaya Farouk bukwanu nwa amadi na efu efu kemgbe na Rivers State. Yabu onye […]
Otu ahu jikoro mpaghara Niger Delta amara dika Pan Niger Delta Forum PANDEF nakwa otu jikoro ndi ndu agburu Urhobo akwala ariri megide onwu ufodu ndi ndu ama ama na obodo Okuama nke Ughelli South LGA dina Delta State bukwanu ndi ana akowa na obuna aka ndi agha military ala anyi jichiri ha ka ha […]
Ulo nzuko omebe iwu Ebonyi State House of Assembly akatola ya na ebe odi ukwuu bu ebubo ajo akparama agwa nke ufodu ndi olu ngo enyere olu okporo uzo di kilometers abuo na otu na otu gaara Ohaozara, Onicha nakwa Afikpo LGAs dicha na ogbonta vote Ebonyi South Senatorial District. Nke a putara ihe unya […]
Govt Enugu State enyela ndumodu gaara ohaneze ndi State a ka ha gharakwa ige nti na ozi awarawa na agaghari sina ana ewe ndi mmadu na olu oyibo ohuru State a. Na odi nso a ka ozi malitere ifesasi na ufodu owa ozi social media na akowa na govt Enugu State na ewe ndi olu […]
Ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti ala anyi akwadola ya gafere nguputa nke ugboro abuo bu atumatu iwu maka nruputakwuo otutu ogige aruike ndi okacha mara banyere oya anya akporo Specialist Eye Care Centres na mpaghara di ichiche nke Nigeria. Yabu atumatu iwu na acho maka mkpatughari aka na iwu National Eye Care Centre Act […]
Etola aka na achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah na ebe odi ukwuu maka mbo ona agba nyere ngalaba mmuta State a okachasi dika osiri metuta olu ngo ulo akwukwo Smart Green Schools omalitere na onumara Wards di nari abuo na iri isii na State a. Otito a putara ihe unya bu Tuesday […]
Nwa amadi ahu aroputaghariri ohuru na okwa onye isi ala mba United States of America bu Donald Trump emela ka amata na oga eji ihe banyere ogbaghara mba Russia nakwa Ukraine mere olu kachasi ya mkpa ngwangwa obanyere na ochichi. Donald Trump mere ka nke a puta ihe taata bu Wednesday na okwu ogwara ndi […]