Opekata mpe ihe ruru mmadụ iri anọ na itolu aburula ndị zụtere ọnwụ ha na nwakpo emere na Plateau State.
Written by Onyinye on April 15, 2025
Opekata mpe ihe ruru mmadụ iri anọ na itolu aburula ndị zụtere ọnwụ ha na nwakpo emere ụnya bu Sunday abalị iri na atọ n’ọnwa April afọ a bu 2025, na Zike hamlet, Kimakpa community Kwall District, di na Irigwe Chiefdom nke Bassa LGA na Plateau State.
Onye odeakwụkwọ mgbasa ozi nke Irigwe Development Association IDA, mere ka amata na ọdachi ahụ mere n’oge ndị mmadụ ka na arụ ụra.
Onye ji anya hụ ihe mere kọwara na mgbo egbe malitere dawa aghara aghara site n’ebe dị iche iche, ebe ahutara mmadụ iri anọ na itolu bu ndị tufuru ndu ha n’ike, dika ọtụtụ ndị mmadụ nwetara ihe mmerụ ahụ.
Nkea n’agbakwụnye mmadụ itolu egburu n’izu ụka gara aga, dika ọkọwara na site n’ọnwa December afọ 2024 ruo taa na obodo Irigwe agukọla opekata mpe mmadụ iri asaa na ise egbugoro na obodo ahụ.
Ha na akpọku government etiti nakwa nke Plateau State ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka, dika ana ario ụmụ afọ Irigwe ka ha dere juu ma nwe nkwenye na ndi nchekwa ga eme ihe ha kwesịrị ime iji weghachite udo na obodo ahụ.
Kosila di, government Plateau State katọrọ n’ebe ọdị ukwu yabu nwakpo, dika Commissioner n’ahụ maka mgbasa ozi nakwa mmekọrịta bu Joyce Ramnap kwuru na mwakpo ahụ bu nke na emegide udo na agamniru na State ahụ.
Joyce mere ka amata na ọchịchị dị ugbua na agba mbọ iji hụ na ekpochapuru ndị ma ọbu otu na eme mwakpo a megide ụmụ afọ State ahụ, ma gwa ndị nchekwa ka ha gba mbọ hụ na ha nwuchiri ndia aka ha dị n’ọba ekere ede.
Na ozi ọzọ, ndị agha nke 3 Division Nigerian Army nakwa Operation Safe Haven azọputala mmadụ iri na isii bu ndi atọrọ na okporouzo Jos-Mangu road na Plateau State.
Onye mgbasa ozi nyere Operation Safe Haven bu Major Samson Zhakom mere ka nkea puta ihe, dika ọkọwara na ndi agha ahụ malitere njem nzọpụta ahụ oge ga huru ụgbọala akwụsịri otu ebe na okporouzo Mararaban Kantoma dị na Mangu LGA na State ahụ n’ihe dika elekere itolu nke abalị ụnya bu Sunday abalị iri na atọ n’ọnwa April afọ a bu 2025.
N’oge ndị ntọri ahụ huru na ndị agha ahụ amalitela Ịgba ha egbe, ha rie mbọ mbọ ọsọ ma hapụ ndị ahụ ha tọrọ, dika ndị agha ahụ gara n’iru zọpụta mmadụ iri na ịsịị tinyekwara ụmụaka.
Kosila di, ndị agha ahụ ka na achọ ndị ntọri ahụ bu ndi nwetara ihe mmerụ ahụ site na mgbọ egbe ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.