Aka ndị uweojii akpatala mmadụ isii bu ndi ana enyo enyo kwere maka ebubo na ha na eji ndị nwere nkpọnwụ arụ ariọ ohaneze arirọ ego.

Written by on April 18, 2025

Aka ndị uweojii akpatala mmadụ isii bu ndi ana enyo enyo kwere maka ebubo na ha na eji ndị nwere nkpọnwụ arụ ariọ ohaneze arirọ ego.

Anwụchiri ndia ana enyo enyo n’oge ha na eme nyocha na mgbede ụnya bu Wednesday na ebe ana arụ ụlọ na Isu Village, Oba, n’oge ha na akpa nkata etu ha ga esi malite njem ha.

Nkea putara ihe n’ụwa ozi ndị uweojii site n’aka onye mmekọrịta ohaneze nyere ndị uweojii bu SP Tochukwu Ikenga taata bu Thursday.

Ozi kọwara na anwụchiri ha site na njikọ aka ndị uweojii sitere Ọba Divisional Police Headquarters nakwa Anambra Vigilante Operation na abalị iri na isii n’ọnwa April afọ 2025 n’ihe dịka ojiri ọkara gafee elekere isii nke mgbede.

Ndị ahụ anwụchiri gụnyere: Doris Basil, dị afọ iri abuo na asatọ, Peter Ezedike, dị afọ iri atọ na asatọ, Susan Monday, dị afọ iri abuo na asaa, Ogechi Okoro, dị afọ iri abuo na asaa, Solomon Sunday, dị afọ iri abuo na itolu nakwa Kenneth Achi, dị afọ iri abuo na itolu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited