Ụlọ olụ Nigeria Railway Corperation adila njikere ititeghari okporo ugbo oloko enwegasiri na mpaghara ala Igbo.

Written by on April 19, 2025

Nwa amadi ahu akpolitere ohuru n’ okwa Managing Director ulo olu Nigerian Railway Corporation (NRC), bu Dr. Kayode Opeifa, emela ka amata na ochichi etiti amalitego ilebara anya n’ iruzighari okporo uzo ugbo oloko ahu sitere Enugu gawa Port Harcourt dika olu ngo di oke mkpa ugbua.

Dr Opeifa mere ka nkea puta ihe n’ oge udolu ufodu ndi nchikwa ulo olu NRC mega njem nkpoturu n’ obi govt state a dina isi Obodo Enugu unya bu Thursday bu ebe onoro kowa na nje m obiara na Enugu bu iji gosiputa uchu ndi nchikwa ulo olu ya di iruko olu nyere govt Enugu State na ngalaba ndi ahu di oke mkpa.

N’ oge ona akowa na yabu okporo ugbo oloko enwetewela nkwado ego site n’ aka ochichi etiti,ka nwa amadi a noro too aka n’ achi Enugu State bu Governor Peter ndubisi mbah maka ezi atumatu mgbanwe ona ewebata na state a,ma n’ akowa nke a dika nke wetagoro ezi onodu obibi ndu nyere ndi mmadu.

Okwekwara nkwa iga n’ iru n’ aruko olu nyere ochichi state a maka ititeghari okporo ugbo oloko nke Port Harcourt-Aba-Enugu rail way line na mpaghara South East ma elegara anya etu ndi ji yabu uzo eme njem azum ahia si akpo oku ya.

Omekwara ka amata na onye isi ala anyi bu president bola Ahmed tinubu enyego ntuziaka gara ulo olu NRC inwe ezi udo mmekorita nyere state a iji tuputa atumatu usoro njem make ikwalite onodu akuluba.

Yabu onye managing director gakwara n’ iru rio governor Enugu State ka okwalitekwuo onodu nchekwa nyere akulungwa ha ji aru olu bu nke ndi n’ akpa akpakara n’ emebisi kemgbe.

N’ aka nke ya ka governor Peter mbah noro me ka amata na Enugu State anorolari na mbu nwe ezi udo mmekorita nyere ulo olu NRC kemgbe achoputala akulungwa coal bu nke ana esite na Enugu ebuga na Port Harcourt n’ afor 1918 site n’ usoro njem ugbo oloko.

Governor mbah gosiputakwara obi anuri ya gara mbo ndi nchikwa ulo olu NRC n’ agba ihu na etiteghariri okporo ugbo oloko na mpaghara South East dika otutu ndi ndu mpaghara ala Igbo siri kpo oku ya, nakwa dika president bola Ahmed tinubu siri nye nkwado ya n’ oge obiara nje m nkpoturu nyere state a na mbido afo a.

Omekwara ka amata na Enugu State tinyekwara states ndi ozo di na mpaghara ala Igbo n’ atu atumatu iruputa otu ahia ga ejiko ha onu, ma buru nke okporo ugbo oloko a ga enye aka n’ ebe odi ukwuu idi n’ esi ebu ngwa ahia.tinyekwara atumatu ochichi ya ji n’ aka irunyegasi okporo ugbo oloko ga enwe njiko nyere nke ulo olu NRC na Enugu State.

K’ osiladi, governor mbah kweziri nkwa inye nkwado gara ebe nlekota aru Ike ndi NRC iji hu na ona aru olu nke oma ma hu n’ echekwabara ulo olu ha n’ aka ndi ekperima.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited