Agbapela ogbako ozuzu abali abuo maka izuputa ndi nwere nka na Abia state
Written by Onyinye on March 22, 2025
Amalitego ogbako ozuzu ga ewe abali abuo bu nke eji akuziri ndi mmadu akolu di iche iche nke ga enyere ha aka ikwuru n’ onwe ha ma ikwalitekwa onodu akuluba na Umuahia bu isi Obodo Abia state.
N’ oge mgbapee yabu ozuzu ka onye odee akwukwo nyeere yabu Steeti, bu Prof Kenneth Kalu kwuputela na ozuzu a bu iji wee zuputa ndi nwere aka olu ,dika nke a bu isi sekpu nti n’ olu ochichi di ugbu a ji n’ aka.
Professor Kalu kwuputela mkpa o di bu yabu ozuzu ebe o bu ebumnobi Governor Otti iji wugharia Steeti ahu ma nyere ndi ga aga yabu ozuzu aka na I nwetakwu amamihe.
Na iga na iru na ozi ekele ya, ka Chief of Staff bu Pastor Caleb Ajagba na onye Commissioner for Information bu Prince Okey Kanu ekenela na ebe o di ukwu yabu Onye odee akwukwo government maka atumatu a ,ma gba ndi ga eje yabu ozuzu ume ka ha gba mbo muta ihe ndi aga ekuziri ha.
Na ozi mbu ya ,ka yabu onye State Head of services Mazi Benson Ojiekere kpokuru ndi ahu ga eje ozuzu a ka ha kaba aru i muta ihe ndi a aga akuziri ha iji wee buru okaibe.
Na aka nke ya ,ka onye Permanent Secretary n’ okwa SSG bu Dr Godwin Okezue kwuru na ozuzu a bu iji wee kwado ndi ga eje ozuzu na ihe gbasara ikpata ego na i nwee amamihe kwesiri ekwesi na yabu olu.
Onye nta akuko anyi kwuru na ozuzu a ga ewe mkpuru ubochi abuo nke onye SSG guzobere nke isi okwu ya bu Cabinet Foundational Skills in Cabinet Operations, Processes and Governance for Effective and Efficient Service Delivery ka Retired Federal Permanent Secretary Mac Nwobiala na ndi ozo no na isi ya.