Aka na-achị Anambra Steeti bụ Gov Chukwuma Soludo etiela ekwuola na ya ahụbeghi onye nwere ikikere ịmeri ya na ntụliaka aga eji họpụta gọvanọ Anambra Steeti
Written by Onyinye on March 19, 2025
Aka na-achị Anambra Steeti bụ Gov Chukwuma Soludo etiela aka n’obi ya sị na ya ahụbeghi onye nwere ikikere ịmeri ya na ntụliaka aga eji họpụta gọvanọ Anambra Steeti ọhụrụ n’abalị asatọ nke ọnwa Novemba n’afọ a.
Gov Soludo kwuru na e nwere nkwekọrịta zuru oke n’etiti ụmụ afọ Anambra Steeti bụ ndị kwuru na otu ndọrọndọrọ All Progressives Grand Alliance APGA emela nke ọma na state ahụ kpatara aga eji nye ha ohere ọzọ ka ha chịa nke ugboro abụọ ya.
Onye ọka mmụta ahụ kwuru nkea n’oge ọgbakọ ejiri merube mmemme afọ atọ n’ọchịchị ya bụ oge ọ nọrọ kwuo na ụmụ afọ ala Igbo nwere ikikere ị tụnyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla masịrị ha na ntụliaka ọchịchị ala anyị mana ha nwere nrubeisi yana ntụkwasị obi nyere otu APGA ma ekwuwe ihe banyere ntụliaka aka ga-achị state yana council ime obodo ndị enwegasiri n’ala Igbo.
Ya bụ nwa amadi jibu ọkwa dịka gọvanọ nke ụlọ akụ ogo etiti ala anyị abụrụla onye ana akpọ oku ka ọ bịa chịa nke ugboro abụọ ya mana otu Party ya bụ APGA ekpebibeghi onye ga ejiri ọkọlọtọ ha zọo ya bụ ọkwa.
Anyị nwetara ozi na Anambra Steeti so n’ime state asatọ ndị ahụ ntụliaka ha anaghị adaba n’oge ntụliaka ọchịchị izugbe n’ala anyị kworo maka nkabi ikpe anọrọ nwee na state ndị ahụ n’oge gara aga.
Ndị ọzọ gụnyere Bayelsa, Edo, Ekiti, Imo, Kogi, Osun yana Ondo State.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.