Chief Olusegun Obasanjo awuchiela Abia State maka mgbape olu ngo ume oku electric aruputara ohuru na State ahu.

Written by on May 7, 2025

Nwa amadi ahu jiburu okwa onye isi ala Nigeria bu Chief Olusegun Obasanjo agala gbape ogige ume oku 30 MVA Power Substation ulo olu Geometric Power Ltd ruputara ohuru na mpaghara Ogbor Hill nke Aba dina Abia State.

Nke a were onodu unya bu Tuesday dika Chief Obasanjo noro na mmeme mgbape olu ngo ogige yabu ume oku too ulo olu Geometric Power Ltd nakwa aka na achi Abia State bu Gov Alex Otti maka ezi olu ha nyere nkwalite ikikere oku electric na mpaghara Aba.

Olusegun Obasanjo yoro ha ka ha gbatikwuo aka ezi olu a gaara Umuahia bu isi obodo yabu Abia State nakwa mpaghara ndi ozo nke State ahu.

Na nke ya ka Gov Otti mere ka amata na onwere mmasi na ebe odi ukwuu nyere ikikere oku kpatara oji kwado ulo olu Geometric Power Ltd na ihe banyere nkwalite oku electric na mpaghara Aba.

Aka na achi State ahu toro Chief Olusegun Obasanjo maka inoro na oge ochichi ya dika onye isi ala nye ulo olu Geometric Power Ltd ikikere nke ahu amara dika License ejiri guzobe ogige Aba Ring-Fenced Electricity Distribution Area.

Okweziri nkwa sina ubara ume oku ulo olu Geometric Power Ltd gana enweta ka aga agbatikwu ruo isi obodo State ahu bu Umuahia.

Na mbu na okwu ya ka onye isi oche ma burukwa Chief Executive Officer CEO yabu ulo olu Geometric Power Ltd bu Prof Barth Nnaji kenere Chief Obasanjo, Gov Otti nakwa ochichi ndi gara aga na Abia State maka nkwado ha nyere nruputa yabu ogige ume oku.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited