Mba Sudan akwụsịla isi na mba Kenya bubata akọrọ ngwa ọbụla n’obodo ha.
Written by Onyinye on March 17, 2025
Mba Sudan ekwupụtala nkwụsị ha kwụsịrị isi na mba Kenya bụ ndị hana ha nwere oke ala were bubata akọrọ ngwa ọbụla n’obodo ha. Ha kwuru na bụ iji gosipụta iwe n’ebe otu ahụ na ama gọọmenti ha aka n’ihu bụ otu akpọrọ Rapid Support Response bụ ndị hana ụsụụ ndị agha mba Sudan lugoro agha ihe ruru afọ abụọ ka ọ dị ugbu a.
Na ọnwa gara aga ka ha bụ otu Rapid support Response binyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta hana otu ha nọ na mba Kenya ị guzobe ọchịchị ọhụrụ na mba Sudan nke ga-eme ka ọchịchị obodo ahụ daruo ala ma nyuo ka ọkụ.
Ọchịchị mba Sudan kwuru na mmachi ọhụrụ ahụ n’ebe o metụtara nzukorita ahịa hana mba Kenya bụ nke ha jiri chọọ ịchekwaba obodo ha n’aka ndị iro ha. Ụfọdụ n’ime akọrọ ngwa mba Sudan si na mba Kenya e bubata n’obodo ha gụnyere ihe oriri dị iche iche, ihe ọṅụṅụ ọtọ biribiri bụ tea tinyere ọgwụ ọṅụṅụ.
Iwu ọhụrụ nke mmachi azụmahịa obodo abụọ ahụ bụ nke sitere n’ọnụ minista n’ahụ maka azụmahịa na mba Sudan.
Ebe mba Kenya n’aka nke ha kana akpọ ekwo sị na ọgbakọ ahụ hana otu Rapid support Response nwere bụ otu ụzọ ha jiri chọọ ị nyere mba Sudan aka mee ka udo lọghachi azụ n’obodo ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.