Ọgba bọọlụ ama ama bụ Ọla Aina akpọla aha mmadụ anọ ihe ha kacha amasị ya na ịkụ egwu awantilo akpọrọ Afrobeats.
Written by Onyinye on March 17, 2025
Onye nkwasu igbudu nyere otu egwuregwu Super Eagles ala anyị bụ Ọla Aina e sonyerela ogbo ya ndị ọzọ were tinye ọnụ n’okwu banyere ndị kacha mara nke ekwe na-akụ na iku egwu awantilo akpọrọ Afrobeats n’ala anyị gbaa gburugburu.
Ya bụ nwa n’agbara otu egwuregwu Nottingham forest ka a jụrụ ya kpọkene aha mmadụ anọ bụ opuru n’iku egwu Afrobeats. N’oge ahụ ka ọ nọrọ were kpọọ aha Burna Boy, Wizkid, Davido yana Àṣàkẹ́.
O mere ka o doo anya na Burna Boy bụ onye nke mbụ kworo maka na egwu ọhụrụ ọbụla o tiputara ga ewuriri ewu, ebe Wizkid bụ onye nke abụọ tupu e nwee Davido dịka onye nke atọ.
Àṣàkẹ́ ka o kwuru na ọ bụ onye nke anọ kworo maka na otebeghi aka ọ malitere iku egwu ebe ya na-atụ anya na ọ ga-emecha bụrụ onye nke mbụ n’ime afọ ndị na-abịa.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.