Onye nlekọta otu egwuregwu bọọlụ nke mba Zimbabwe bụ Michael Nees agwala ndị otu egwuregwu ya ka ha dị njikere ịzụta ogbo ha bụ Super Eagles.
Written by Onyinye on March 24, 2025
Onye nlekọta otu egwuregwu bọọlụ nke mba Zimbabwe bụ Michael Nees agwala ndị otu egwuregwu ya ka ha kee ajụ na ume ma dị njikere ịzụta ogbo ha bụ Super Eagles ala anyị maka asọmpi eji etozu oke ndị ga-eso zoo ike mba ụwa nke afọ 2026.
Ha bụ otu egwuregwu akpọrọ warriors ga ezute ala anyị n’ụbọchị Tuesday nke ịzụ ụka anyị banyere n’ime ya kpọmkwem na ama egwuregwu God’swill Akpabio international stadium dina Ụyọ bụ ịsị obodo Akwa Ibom state.
Mba Zimbabwe ka ji naanị akara points atọ n’ime asọmpi ndị ha sọgoro n’otu group C ha so na ya mana onwebeghi nke ha meriri n’ime ha.
N’oge ha zutere otu Cheetah nke mba Benin republic na ama egwuregwu Moses Mabhida dị n’obodo Durban n’ụbọchị Tuesday gara-aga ka ha gbara onwe ha onye laba.
Ugbua, ya bụ onye nlekọta coach bụ Michael Nees ekwuola na ha agaghị ezu ike ma ọ bụ tinyere ụra na anya ruo mgbe has zutechara ndị niile nke ha kwesịrị ịzụta ma nwaa ike ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.