Otu NBA ebughariala ogbako ha tinyeburu na Rivers state ma bugazia ya na Enugu.

Written by on April 12, 2025

Otu Nigeria Bar Association NBA emela ka amata na ha ebughariala ogbako ha nke afo a akporo 2025 Annual General Conference (AGC) bu nke ha tinyeburu na Port Harcourt bu isi Obodo Rivers State ka oburuzia na Enugu kwere maka ihe ha kowara dika usoro ochichi n’agbasoghi iwu nakwa ndakpo nke ochichi onye kwuo Uche ya ana ahuta na Rivers state.

N’ akwukwo ozi ha weputere na mgbede unya bu Thursday nke onye president otu NBA bu Afam osigwe (SAN) onye General secretary ha bu mobilaji ojibara nakwa chairman nke AGC planning committee bu Emeka obegolu (SAN) gbakoro aka onu binye aka, ka otu NBA noro kowa si,na nkpebi a n’ abia kwere make usoro ochichi ohuru daputara na state ahu n’ odi nso a ma buru nke megidere usoro iwu ala anyi.

N’ oge ha nwechara mkparita ububo nyere onye isi oche otu NBA ngalaba ha nke Rivers state tinyekwara nzuko ntumadi otu National Executive council (NEC) nwere na abali iri abuo na asaa nke onwa March afo a,ka habu otu NBA noro nwe nkpebi ibughari ogbako ahu gaa na state ozo. Ebe yabu otu NEC noro katoo ya n’ ebe odi ukwuu bu nkwusi akwusiri ndi akpolitere n’ okwa ochichi n’ usoro ntuliaka nakwa ulo olu govt di iche iche na state ahu,ma kpo oku gara ulo nzuko omebe iwu ogogo etiti ala anyi ka ha lebara ya anya.

Otu NBA kwuputara nkpolite akpolitere onye sole Administrator na Rivers state dika nke n’ agbasoghi usoro iwu ma burukwa nke megidere ochichi onye kwuo Uche ya.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited