Ụlọikpe dina mba South Korea akachapula ọchụchu achuru onye jibu ọkwa prime Minister na mba ahụ bụ Han Duck Soo.
Written by Onyinye on March 24, 2025
Ụlọikpe dina mba South Korea akachapula ọchụchu achuru onye jibu ọkwa prime Minister na mba ahụ bụ Han Duck Soo ma kpọghachi azụ dịka onye ga ejigodu ọkwa nke onyeisi ala na mba South Korea.
Han Duck Soo malitere ọrụ ya n’ọnwa December gara aga n’oge ahụ achuru President Yoon Suk Yeol n’ọrụ ya site n’aka ndị omebe iwu nke mba ahụ kworo maka ububo nke ọ kpara iguzobe iwu ndị agha akpọrọ martial law.
Ka osiladi, Han Duck Soo mechara nọo naanị izu ụka abụọ tupu ndị omebe iwu ahụ amalitekwa ịkpa ububo etu ha ga esi chụọ ya n’otu aka ahụ. Kemgbe ahụ, mba South Korea abụrụla nke onye nọ n’isi ya bụ deputy prime Minister ha bụ Choi Sang Mok.
South Korea bụkwa nke ọgba aghara okwe ndọrọndọrọ ọchịchị nọ na arị ibe ya elu ozugbo amụma martial law ahụ kpụchara afọ n’ala.
Ngwa ngwa nwa amadi ahụ Ụlọikpe weghachiri azụ ugbua dịka acting president malitere ọrụ ya ka o nyere na agaghị akpolite ndị ọka ikpe ọhụrụ nọkwa.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.