Eliela ozu nke Sam Nujoma bụ onye mbụ chịrị mba Namibia malite n’afọ ndị 90s ruo n’afọ 2005
Written by Onyinye on March 3, 2025
Nwa amadi ahụ so were lụọ ọgụ maka mnwere onwe mba Namibia bụ Sam Nujoma abụrụla onye adọnyere ozu ya n’ala n’ụbọchị Saturday nke ngwụcha izu ụka anyị pụrụ n’ime ya.
Mmemme akwamozu ya bụ dọtara ndị gụnyere nwunye ya ọ hapụrụ laa mmụọ, ụmụ ya, ụmụ ụmụ ya tinyere ndị ọchịchị n’ala ndị isi ojii ndị nọ anọ na ndị chigoro achị.
N’oge ahụ ka onyeisi ala mba Namibia bụ President Nangolo Mbumba nọrọ kọwaa Sam Nujoma dịka dike n’agha so were lụọ ọgụ ịnapụta ala ndị isi ojii n’ọchịchị nchigbu nke ndị ọcha.
Ahụtakwara ọtụtụ ụmụ afọ mba Namibia ka ha gbakọrọ kemgbe ụtụtụ ụbọchị ahụ bịa iruru nwoke ahụ bụ onye gbara afọ iri itoolu na ise tupu ọ laa mmụọ uju nke ọnwụ ya.
Sam Nujoma bụ onye chụrụ ehi n’oge ọ dị na nwata mechara sonyere ogbo ya ndị ọzọ were buo agha maka mnwere onwe obodo ya bụ Namibia site n’aka ndị ọcha yana ọchịchị nkewa akpọrọ apartheid rule nke dịbu n’oge ahụ na mba South Africa.
A kọwara nwoke a dịka ọgbọ ikpeazụ n’ime ndị ahụ lụrụ ọgụ etu ndị niile enwere n’ala Afrịka ga-esi nwere onwe n’ọchịchị ndị ọcha akpọrọ colonial rule.
Sam Nujoma mechara chịa obodo ya bụ Namibia malite n’afọ 1990 ruo n’afọ 2005 bụ oge e kwuru na udo tọrọ atọ kachasị kwudosie ike na mba Namibia.