Opekata mpe ya buru mmadu iri abuo na ato tufuru ndu ha na nkusu ohuru mba Israel megara mpaghara Gaza’s strip
Written by Onyinye on April 16, 2025
Ndi agha otu isi ekwe onwu Hamas emela ka amata na atumatu nile banyere otu ahu n’ achikwa ndi agha mba US nakwa Israel akporo Edan Alexander akpupula afo n’ ala dika mba Israel buoro ogbu n’ igwe banye n’ ebe ahu edobere ndi eji eji.
Ndi nta akuko nwetara ozi na opekata mpe ya buru mmadu iri abuo na ato ka egburu site na agha nkusu ahu mba Israel buoro banye na mpaghara Gaza’s strip kemgbe abali unya bu Tuesday ma ka n’ akowakwa na ozi banyere otutu nkusu nakwa ndi nwetara ihe mmeru aru ka n’ agakwa n’ iru.
Ulo olu aru Ike nke mpaghara Gaza mere ka amata na opekata mpe ya buru mmadu di puku iri ise na otu bu umu afo mba Palestine bu ndi tufugoro ndu ha ,ebe mmadu di otu nari puku na iri n’ isii,nari ato na iri ano na ato nwetara ihe mmeru na agha ahu mba Israel buru banye mpaghara Gaza kemgbe onwa iri na asato gara aga.
Iga echetazi n’ obu na abali asato nke onwa October afo 2023 ka agha ahu n’ ada n’ etiti mba Israel nakwa Palestine malitere ebe ndi eji eji kariri nari abuo.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.