Ndi uweojii na Rivers State emela ka amata maka nwakpo nakwa ntaramahụhụ emere onye nchịkwa nke Ahoada-East LGA bu Hon. Goodluck Iheanachor site n’aka ihe ruru mmadụ iri atọ bu ndi ana ebo ebubo na ọ bu ndi na arụ ya ọrụ n’ọkwa Chief Security Officer CSO nakwa Chief of Staff COS nọ n’isi ya. […]
Ụlọ ikpe dị na Ikorodu, Lagos State anọrọla taata bu Monday ziga otu nwoke dị afọ iri anọ bụ Seun Olakunle n’ụlọ ọrụ mgbazi maka ịwaba n’ụlọ wee zuo eriri eletrịkị yabu electrical cable dị nde naira atọ. Onye Chief Magistrate bu Mazi B. A. Sonuga nyere iwu ka nwa amadi ahụ nọrọ n’ụlọ ọrụ […]
Ụlọ akwụkwọ mahadum nke Ibrahim Badamasi Babangida University IBBUL nọ n’iru uju dika ozi kọwara na onye ana enyo enyo na ọ bu onye ori ji mma magbuo nwata akwụkwọ nọ 200 level n’ụlọ akwụkwọ mahadum ahụ. Yabu ọdachi bu nke tinyere ụlọ akwụkwọ mahadum ahụ na gbagharia, bukwa nke kpaliri oke echichi gbasara nchekwa […]
Ọdụ ụgbọelu Chuba Ọkadigbo International Airport dị na Ọnụeke, bụ isi ụlọ ọrụ nke Ezza South LGA na Ebonyi State, amalitela inwe nnukwu ndị njem dika ụgbọelu azụmahịa si Legọs gbatutere n’ọdụ ụgbọelu ahụ nenweghi nsogbu ọbula. Nke a na-abịa dika mkpụrụ ụbọchị ole mole ụgbọelu azụmahịa si Abuja malitere igbatu na ọdụ ụgbọelu mba […]
Nwa amadi ahụ na anọchite anya Abia North ma burukwa onye isi oche Senate Committee on Privatisation bu Senator Orji Uzor Kalu, emela ka amata na ebumnuche ya ịbụ onye isi ala bu nke ga echeregidi ganye mgbe onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu chizuru ọchịchị nke ugboro abuo ya. N’oge ọ […]
Government etiti anọrọla taata bu Thursday mechie ikpe ya na ikpe ahụ n’aga n’iru nke onye ndu otu Indigenous People of Biafra IPOB bu Mazi Nnamdi Kanu, na ebubo metụtara iyi ọha egwu nakwa ịgba ọchịchị mgba okpuru. Onye ọkaikpe government etiti bu Chief Adegboyega Awomolo SAN, mere ka nkea puta ihe dika onye akaebe […]
Aka na achị Enugu State bu Governor Peter Ndubuisi Mbah, mere ka amata na State a so n’ime States nwere ezi nchekwa na ala anyi a, na agbanyeghị okwu asi ụfọdụ ndị mmadụ na ekwugasi. Governor Mbah kwuru na State a weputagasiri ezi atụmatụ ma tinye oke ya n’ebe ọdị ukwu iji weta ogbugbo nyere […]
Otu igwe onyonyo nke ọ bụ mba Iran nwe ya anọrọla n’ụbọchị Tuesday were gwa ụmụ afọ ha ka onye ọ bụla gbaa mbọ wepụ ọwa ozi ọgbara ọhụrụ akpọrọ WhatsApp na ekwe ntị ha iji gbochie mba Israel ịga n’ihu na enweta ihe nzuzo banyere obodo ha. Ozi ahụ ka ya bụ ọwa ozi […]
Obodo Xuchang nke dị na mpaghara Henan province nke mba China abụrụla ebe amara n’ụwa niile dịka ebe a kacha emepụta ntutu isi adigboroja akpọrọ wig nke ruru percent iri isii ụmụ nwaanyị na ekpu n’isi ha n’ụwa niile gbaa gburugburu. N’obodo ahụ ka enwere ụlọrụ na emepụta ya nke ruru puku anọ na otu […]
Agha ahụ na-ada na mba Sudan agala n’ihu na akawanye njọ kwa ụbọchị bụ nke e kwuru n’ihe kpatara ya bụ etu ndị mmadụ si were na ebubata ngwa agha dị iche iche na mba ahụ n’ụzọ mkpuke nke kpatara na ọ kaga ete aka tupu ya bụ agha akwụsị. Ndị ọkachamara mere nyochaa na […]