News
Page: 13
Nwamadi ahu bu onye obu abu Chineke bu maazi Nathaniel Bassey onorola unya bu Thursday wee kwuputa na ya ga emerube mmeme ncheta ubochi omume ya taata bu Friday dika ya na gba afo iri ano na ano amuru ya. Yabu onye oje ozi chineke, gakwara na iru kwuputa na obu yana ndi noo na […]
Ohaneze Ndigbo na Abia State ekwuputala njikere ha di ihu na akwalite omenala igbo na ala anyi a ma iwebata udo toro ato na etiti ndi igbo nille. Nke a putara ihe site na onu onye isi oche ohaneze ndigbo na state ahu bu Dr. Chukwuemeka Chinyere Okwuonu unya bu Thursday oge hana edu ndi […]
Puku kwuru puku ndị mmadụ na mba Australia emela njem ngaghari iwe na ọtụtụ obodo dịgasị na mba ahụ, dika ha na akpọ ọkụ ka agbatara ụmụ afọ Gaza dị na mba Palestine bu ndị ana egbu kwa ụbọchị nakwa ndị nke na akwụ agụ na mba ahụ ọsọ enyemaka. Ihe karịrị otu iri na […]
Ndị uweojii ala anyị na Nasarawa State ekwuputala ezi ọrụ ha banyere mgba ha na agba emegide ndị omekome, ma nwụchikọ ụfọdụ ndị ntọri nakwa onyi ịsị ndị otu oji egbe aga na akpa ike ọjọ na State ahụ. Nkea pụtara ihe ụnya bu Sunday site n’aka onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uweojii na State […]
Speaker ụlọ omebe iwu Benue State House of Assembly bu Aondona Dajoh, agbala ọkwa ya dika Speaker nke ụlọ omebe iwu ahụ arụkwaghim. Ozi arụkwaghịm ahụ putara ihe ụnya bu Sunday abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa August afọ a bu 2025, bụkwanụ nke o bịnyere aka na ya. Dajoh mere ka amata na ịgba […]
Ndị uweojii ala anyị na Akwa Ibom State ejichiela mmadụ anọ ana enyo enyo na ha na agba mgbere ọgwụ ike maka ịkpụpụ ha n’ụlọ ikpe na Uyo bu isi obodo State ahụ. Nkea putara ihe nye ndị nta akụkọ, site n’aka onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uweojii na State ahụ bu DSP Timfon John […]
Otu onye osi nri na Nigeria amara dika Hilda Baci emela ka amata na ya choro ka aha banye na akwukwo ndeko world Guinness record dika onye izizi siri ite nri kacha buo ibu na elu uwa. Yabu onye osi nri mere ka nke a puta ihe na ozi oweputara na owa ozi mmekorita ohaneze […]
Ndi uwe oji ala anyi na Enugu State anwuchiela mmadu asaato ana enyo enyo na ha bu ndi ori, ma naputa ha ugbala asaato ha ziri na ori. Habu ndi uwe oji ala anyi na state a gakwara na iru kwuputa na nke bu kwere maka enyocha kpu oku na onu nke ha bidoro na […]
Otu World Health Organization tinyerekwara otu world meteorological organization adola aka na nti gara ndi mmadu okachasi ndi oru na uwa gba gburugburu gbasara onodu amaghi kwuru nke ihu eligwe. Habu otu abuo mere ka amata na nnukwute oke okpomoku na abia nke ga ebi aruike ndi mmadu aka ojoo ma oburu na emeghi ngwa […]
Adola aka na nti gara mba Israel ka ha hapu ndi oru mgbasa ozi ka ha na abata na mba ahu wee na enwete ozi ka ihe si aga na enweghi ihe mkpobi ukwu obuna. Okpukpo oku a na abia dika mba United kingdoms sonyechara mba iri abuo na isii ahu na abu agha emegide […]