Latest Updates
Page: 4
Government etiti ekwuputala ụbọchị Friday abalị isii nakwa Monday abalị itoolu n’ọnwa June afọ a bu 2025 dika ụbọchị ezumike yabu public holiday iji merube mmemme Edi-ul-Adha nke afọ a. N’ozi putara ihe taata bu Monday na Abuja site n’aka onye Permanent Secretary nke ụlọ ọrụ Ministry of Interior bu Dr. Magdalene Ajani, kwuputara na […]
Aka ndị uweojii na Anambra State akpatala mmadụ atọ ana enyo enyo na ha so n’otu ndị oji egbe aga bu ndi aka ọrụ ha bu iji egbe punari ndị mmadụ ihe ha nwere n’ike ọkachasi ọgbọ ala. N’ozi putara ihe taata bu Monday site n’aka ọnụ na ekwuchitere ndị uweojii na State ahụ bu […]
Ọgba bọọlụ ama ama n’otu Super Eagles bụ Ahmed Musa alụbatala nwunye nke anọ ya bụ Asmau Moriki. Mmemme alụmdi na nwunye ha bụ nke ana achọghị ka ọhaneze sonyere were ọnọdụ kpọmkwem na Kano State. Nwa amadi ahụ ụkwụ na aghọ nke lụrụ nwunye nke mbụ ya bụ Jamila n’afọ 2013 mana ha abụọ […]
Ụlọrụ n’ahụ maka mmanụ ụgbọala n’ala anyị bụ Nigeria National Petroleum Corperation limited ebudatala ọnụ ahịa ana ere mmanụ ụgbọala amara dịka Premium Motor Spirit PMS na ntụ lita. Na mgbe ndị nta akụkọ agagharịri na ụfọdụ ogige ụlọrụ ahụ n’ebe dịka Kubwa Expressway, Central Business District yana Wuse Zone 4 dicha na Abuja ka […]
Otu onye nkụzi mahadum nke Benue state University dina Markudi bụ Dr Godwin Kwanga bụ onye aka ndị ntori kpara na ọ dị nso a enwerela onwe ya. Dr Kwanga bụ onye nkụzi na ngalaba ihe ọmụmụ Geography ka a zọpụtara ụnyaahụ bụ Saturday site n’aka ndị uwe ojii akpọrọ operation Zenda yana ogbo ha […]
Aka ndị uweojii na Rivers State akpatala otu onye ukochukwu enyedebere aha ya dika Lucky kwere maka na ọ wakporo otu nwatakịrị nwanyị dị afọ iri na Ihuaje community dị na Ahoada East LGA na State ahụ. Nwuchi nwa amadi a bu nke sitere n’aka otu ndị nchekwa ime obodo amakariri dịka ONELGA Security Planning […]
Ihe ọdachi dị egwu mere na Aba, Abia State, ụnya bu Wednesday dika ebe ana agbasa ozi yabu Advertising billboard dara ma dakwasi ọtụtụ ụgbọala nwere ụkwụ atọ amakariri dịka keke bucha ndị mmadụ, dika ọtụtụ ndị mmadụ nwetara ihe mmerụ ahụ ebe ụfọdụ zụtara ọnwụ n’ike. Ihe ọdachi a mere na Salad Market junction […]
Nwa amadi ahụ jibu ọkwa Governor na Anambra State bu Chief Willie Obiano, akagbuola akụkọ ahụ na efeghari n’ụwa ozi bu nke na akọ na ọ na akwado otu onye pụtara izo ọkwa Governor na ntule aka ọchịchị Anambra Governorship Election aga eme n’odi n’iru. Nkea sochiri dika ahụtara akụkọ na efeghari na uwa ozi […]
Ndị ụlọ ọrụ National Emergency Management NEMA, kwuputara na opekata mpe ihe ruru mmadụ iri abụọ na ise zụtara ọnwụ ha, mmadụ otu narị na iri isii na isii nwetara ihe merụ ahụ, ebe ezinụlọ puku itoolu na narị atọ na iri ise na abụọ bu ndi ọdachi ide mmiri metụtara na afọ 2024 na […]
President mba Ukraine bu President Volodymyr Zelensky adila njikere izute onye Chancellor mba Germany bu Friedrich Merz dika mba Ukraine n’ ario enye m aka ndi agha banyere mbawanye igbu n’ igwe mba Russia ji ebuso ha agha n’ agbanyeghi mbo nile mba US gbagoro iji gbochie agba ahu n’ ada n’ etiti ha . […]