News
Page: 7
Ulo nzuko omebe iwu Ebonyi State House of Assembly akatola ya na ebe odi ukwuu bu ebubo ajo akparama agwa nke ufodu ndi olu ngo enyere olu okporo uzo di kilometers abuo na otu na otu gaara Ohaozara, Onicha nakwa Afikpo LGAs dicha na ogbonta vote Ebonyi South Senatorial District. Nke a putara ihe unya […]
Govt Enugu State enyela ndumodu gaara ohaneze ndi State a ka ha gharakwa ige nti na ozi awarawa na agaghari sina ana ewe ndi mmadu na olu oyibo ohuru State a. Na odi nso a ka ozi malitere ifesasi na ufodu owa ozi social media na akowa na govt Enugu State na ewe ndi olu […]
Ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti ala anyi akwadola ya gafere nguputa nke ugboro abuo bu atumatu iwu maka nruputakwuo otutu ogige aruike ndi okacha mara banyere oya anya akporo Specialist Eye Care Centres na mpaghara di ichiche nke Nigeria. Yabu atumatu iwu na acho maka mkpatughari aka na iwu National Eye Care Centre Act […]
Etola aka na achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah na ebe odi ukwuu maka mbo ona agba nyere ngalaba mmuta State a okachasi dika osiri metuta olu ngo ulo akwukwo Smart Green Schools omalitere na onumara Wards di nari abuo na iri isii na State a. Otito a putara ihe unya bu Tuesday […]
Opekata mpe mmadu isii ezutela onwu mberede ha na ihe mberede okporo uzo mere ohuru ozo na ogologo okporo uzo Awuyo/Adiyani Expressway dina Guri LGA nke Jigawa State. Yabu odachi ka ozi kowara na obu na abali putara taata bu Wednesday ka owere onodu dika ogasiri naani abali abuo ihe mberede okporo uzo ozo mere […]
Ulo olu nnochite anya mba United States of America akporo US Embassy enyela ntuzi aka ohuru gaara umu afo Nigeria na acho ohere Visa isite ala anyi a gawa mba America na usoro ha ga agbasoro. Nke a bu dika osiri metuta ndi ahu nnwale ha maka yabu ohere Visa ga ewere onodu ma ogasia […]
Ulo olu ministry ogogo etiti ala anyi na ahu maka olu nakwa ulo olu nke ahu na ahu maka ngote akuru ngwa eji aru olu ohaneze amara dika Bureau of Public Procurement BPP amalitela amuma iji buo agha megide ihe mgbochi ndi ahu na adi na eme ka olu ngo na akpu na afo na […]
Ayiola ndi okpu ugboala ka ha gbado anya nke oma na ihe banyere nleta ezi onodu ugboala ha tupu ha ebuputa ha na okporo uzo, iji zeere ihe mberede okporo uzo ana adi na ahutakari okachasi na oge mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru na akpudobe nso. Ayiyo a putara ihe na ngwucha izu uka […]
Nwa amadi ahu jigodu okwa ochi agha izugbe ndi agha elu ala Nigerian Army na okwa Acting Chief of Army Staff bu Lt Gen Olufemi Oluyede anorola taata bu Monday malite olu dika ochi agha izugbe ndi agha ala anyi a na ozuzu oke ya na udi nke akporo Substantive Chief of Army Staff. Malite […]