Otu nọrọ onwe ya akpọrọ Coalition of South East Youth Leaders enyela ndị Fulani naanị mkpụrụ abalị abụọ ka ha sina Enugu State pụọ
Written by Onyinye on March 6, 2025
Otu akpọrọ Coalition of South East Youth Leaders enyela ndị Fulani na-achị ehi bụ ndị ahụ ji Enugu state mere isi ọnọdụ naanị mkpụrụ abalị abụọ ka ha kwara ngwongwo ha pụọ n’eleghi anya n’azụ.
Otu ahụ kwuru nkea site n’akwụkwọ ozi ha wepụtara taa bụ Wednesday nke ọ bụ onye President General ha bụ Goodluck Ibem binyere ya aka were kwuo sina ọ bụ kworo maka akụkọ chi bọọ anụ ọzọ banyere ebubo ịwakpo nwaanyị n’ike site n’aka ndị ana atụ anya na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi n’obodo Eha Amufu nke dina council ime obodo Isi Ụzọ na Enugu state.
Ibem ka tọrọ agwa ndị ahụ ana atụ anya na ha bụ ndị na-achị ehi ma kọwaa ya dịka nke sitere n’aka ekwensu yana afọ tara mmiri.
Dịka nwa amadi ahụ sịrị kọwaa, na ndị ahụ abụghị ndị na-achị ehi kama na ha na-emewa onwe ha dịka ndị Fulani iji kpaa arụ dị iche iche bụ nke ejirimara ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.