Otu nwoke e gburu nwa ya n’ụzọ iwu na akwadoghi na Abịa State akwala arịrị ka a gbatara ya ọsọ enyemaka site na ịnye nwa ahụ ikpe nkwụmoto.

Written by on March 12, 2025

Otu nwa afọ obodo Ụmụikpa nke dina Akanu Item nke council ime obodo Bende na Abịa State bụ Mr Isaac Maduka akwala arịrị ka a gbatara ya ọsọ enyemaka n’ebe o metụtara ịnye nwa ya egburu n’ike ikpe nkwụmoto bụ Ndukwe Isaac gbara afọ iri abụọ ma bụrụ onye egburu site n’aka ndị ntorobịa obodo ahụ.

Mr Isaac Maduka kwuru na njiji ahụ jiri n’abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa January gara aga ewetala ezinụlọ ya ihe iru uju na ihusi anya.

Na nkọwa ya ka Mr Maduka kọwara na nwa ya ahụ bụ Ndukwe ka yana nne ya bụ Ụwaezuo Isaac bi n’obodo Okai Bende ebe ha nọ na akọputa nri ji na osikapa. N’oge ahụ ka Ndukwe rịọrọ nne ya ka onyetu ya obere ego ka o jiri goo akwa na akpụkpọ ụkwụ.

Ozi gara n’ihu kọwaa na nwaanyị ahụ jụrụ ime nke ahụ nke kpatara na Ndukwe Isaac gara were ego otu narị na puku naira iri ₦110,000 n’ebe nne ya na edobe ego.

N’oge esemokwu malitere ka Ndukwe Isaac gwara nne ya na ọ bụ ya were ya bụ ego nke ya sitere n’ime ya goo akwa, igwe okwu radio yana ụdọ ọkụ latric nke ha ga-eji dozie ụlọ ha ebe ego dị puku naira iri asaa na ise ₦75,000 ka fọrọ ya n’aka.

Ozugbo ahụ ka nwanne nwaanyị ahụ bụ Anyim Igwe kpọrọ nwata nwoke ahụ ana ebo ebubo gaa nyefee n’aka ndị ntorobịa obodo ahụ. N’oge ahụ kwa ka otu onye e nyere aha ya dịka Ndukwe Igara kpọturu onyeze ọdịnala na elekọta obodo ahụ bụ HRH Eze James Opara Ogbonna Ezeugo nke mbụ n’obodo Okai Item autonomous community bu onye sitere n’oku ekwe ntị gwa ha ka enyefe ya n’aka ndị ntorobịa ka ha dozie ya etu ọ masịrị ha.

Nwoke ahụ egburu nwa ya gara n’ihu kọwaa na e mechara kee nwa ya ahụ agbụ ma tie ya ka akpa aja ruo mgbe o kubiri nke ha mechakwara kpọọ ya ka ọ bịa buru ozu nwa ya lie.

Mr Maduka Isaac n’ozi ugbua na-akpọku ọhaneze tinyere gọọmenti Abia State ka ha gbatara ya ọsọ enyemaka ọkachasi egwu nke o kwuru na ndị mmadụ amalitela iyi na ndụ ya tinyere etu aga esi nye nwa ahụ ikpe nkwụmoto.

Mana mgbe ndị nta akụkọ kpọturu onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uwe ojii na Abia steeti bụ ASP Maureen Chilaka ka o nyere Maduka ndụmọdụ ka ọ ga mee mkpesa ọhụrụ banyere egwu ahụ a malitere iyi na ndụ n’ogige ndị uwe ojii ọbụla dị ya nso.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited