Otu onye uwe ojii nọ nọkwa inspector e nyere aha ya dịka inspector Ajele Oloyede nwụọla site na ọnyá egbe ọ gbara onwe ya

Written by on March 17, 2025

Otu onye uwe ojii nọ nọkwa inspector e nyere aha ya dịka inspector Ajele Oloyede ka ozi kwuru na ọ nwụọla site na ọnyá egbe ọ gbara onwe ya n’ogige ụlọrụ ceramics company dina Igbesa Ogun State bụ ebe ọ na-arụ ọrụ dịka onye ọrụ nchekwa.

Ndị nta akụkọ nwetara ozi na ọ bụ n’ime izu ụka anyị pụrụ n’ime ya ka ya bụ njinji nọrọ jie.

Dịka ọnụ na e kwuru ndị uwe ojii na state ahụ bụ Omolola Odutola siri kọwaa, na onye uwe ojii ọzọ nọ ọrụ n’ogige Force headquarters annex dina Lagos bụ Tolorunloju Stephen bụ ya hutara nwoke ahụ ozugbo o si na Ikeja lọta ọrụ n’oge oji nkeji iri abụọ gafee elekere mbụ nke ụbọchị ahụ.

Stephen kwuru na ya hụrụ Inspector Oloyede ka ọ tụkwasịrị isi ya n’elu oche nke dina ụlọrụ ndị nche ahụ.

Na mgbe ọ jụrụ onye Inspector ahụ ihe bụ nsogbu ya ka o kwuru na nsogbu adịghị. Stephen gara n’ihu tụkwasị akpa ya yana egbe ọdị nkenke ime ire akpọrọ pistol n’otu elu oche ahụ ma banye n’ime ụlọ ịga mposi.

Ka o mechara naanị nkeji ole na ole ka a nụrụ ụda egbe nke a bịara chọpụta na inspector Oloyede agbagbuola onwe ya.

Emere ngwa ngwa buga ya n’ụlọ ọgwụ Ọta General Hospital bụ ebe ndị ọrụ dibịa bekee nọrọ kwuo na ọ bụgoro onye nwụrụ anwụ.

PPRO Omolola Odutola kwuru na ha enyefela okwu ahụ n’aka otu Criminal Investigation Department dina Eleweran maka ime nyochaa miri emi ịmata nke bụ eziokwu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited