Ulo ikpe mba America enyela iwu ohuru gaara ebubo agwa ekperima ana ebo President Bola Ahmed Tinubu na achi ala anyi.
Written by Onyinye on April 14, 2025
Ulo olu nchekwa oje na mmuo mba United States of America amara dika Federal Bureau of Investigation FBI nakwa nke na ebu agha emegide ogwu ojo bu US Drug Enforcement Administration DEA anatala iwu sitere na ulo ikpe mba ahu bu nke gwara ha ka ha weputa akwukwo niile ejiri deko nnyocha agwa ekperima akporo Criminal Investigations megide onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu na ebubo itu mgbere ogwu ike bu Drug Trafficking.
Nke a putara ihe dika osiri di na iwu Judge Beryl Howell nke ulo ikpe US District Court dina mpaghara Columbia nyere gaara ebubo agwa ekperima a.
Yabu iwu ulo ikpe rutere ndi nta akuko aka unya bu uka ka emere ka amata na obu kemgbe abali asato nke onwa a bu April ma buru ubochi Tuesday nke izu uka gara aga ka okaikpe ahu nyere ya.
Judge Howell nyere habu ulo olu FBI nakwa nke DEA iwu ka ha choo ma weputa dika osiri di na ikikere iwu Freedom of Information Act ihe niile banyere nnyocha ekperima yabu ebubo mgbere ogwu ike ana ebo President Tinubu.
Iwu a bu dika osiri di na ayiyo onye nchocha American Researcher bu Aaron Greenspan yoro ulo ikpe ahu.
Ozi mere ka amata na obu kemgbe agbata afo 2022 ruo 2023 ka Aaron Greenspan gbara akwukwo na ulo ikpe mana acho inweta ozi niile banyere nnyocha emere President Bola Ahmed Tinubu nakwa ndi ozo na yabu ebubo itu mgbere ogwu ike.
Ndi nta akuko nwetaziri ozi na obu na mbido afo ndi 1990s ka ana ebo ebubo na ndi gunyere: Bola Ahmed Tinubu, Lee Andrew Edwards, Mueez Adegboyega Akande nakwa Abiodun Agbele turu yabu mgbere ogwu ike na mpaghara Chicago nke mba United States of America.